Trump Kwusiri Ike Na United States Gà Enwere Ike Izipụ Ndị Agha Ma Ọ Bụrụ Kwa Ịkụ Bombụ Na Nigeria Maka Igbu Ndị Kraịst
Onye isi ala United States, Donald Trump, ekwuola na America nwere ike izipu ndị agha ma ọ bụ kụọ ọdụmbọmbụ na Nigeria n’ihi ihe ọ kọwara dịka igbu ọtụtụ ndị Kraịst n’ala Nigeria.
Na-ekwu okwu n’ ụgbọ elu Air Force One ka ọ na-alọta Washington site na Florida n’ụbọchị Sọnde, Trump kwuru na United States na-ele ọnọdụ ahụ nke ọma ma nwee ike ime ihe ozugbo ma ọ bụrụ na mmegbu ahụ aga n’ihu.
“O nwere ike ịbụ. Enwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ime,” ka Trump kwuru mgbe a jụrụ ya ma ọ bụ na-ekwu maka izipu ndị agha ma ọ bụ ịkụ ọdụmbọmbụ.
“Ha na-egbu ndị Kraịst n’ọnụọgụ dị elu… Anyị agaghị ekwe ka nke ahụ na-aga n’ihu,” ka o kwuputara.
America n’oge na-adịbeghị anya tinyere Nigeria n’akụkụ Countries of Particular Concern (CPC) – mba ndị a na-ebo ebubo n’ịkụda nnwere onwe okpukpe.
Gọọmenti Nigeria enweghị azịza ọ bụla pụta ìhè maka nkwupụta Trump ruo ugbu a.
Nkwupụta